Euthalie Nyirabega
Ọdịdị
Euthalie Nyirabega bụ nwanyị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Rwanda a mụrụ na 1966 na Nyanza, ọ bụkwa onye otu nzuko omeiwu Rwanda ugbu a.
Okwu ndị okwuru
[dezie]- Rwanda kwesịrị itinye aka n'ihe ngwọta sitere n'ụlọ iji dozie nsogbu dị iche iche nke nwoke na nwanyị.
- New study shows majority women support wife-beating The New Times, (November 16, 2022)
- O kwesịrị ịbụ ọrụ dịịrị onye ọ bụla karịsịa ndị nne na nna ime ihe n'ụzọ kwesịrị ekwesị na ịkwado ụlọ ọrụ niile iji luso ọnọdụ nke GBV ọgụ, mmetọ ụmụaka na ịkọkwa ezinụlọ ndị ọzọ na-eche esemokwu ezinụlọ ihu.
- Anti-GBV, human trafficking campaign goes to Nyanza The New Times, (October 21, 2014)
- Na Rwanda dịka ọmụmaatụ Otu ehi kwa ezinụlọ, Village Umurenge, Mmebi ihe ubi, na imezigharị ọrụ ugbo site n'ịchịkọta ndị obodo ka ha nwee ngalaba nhazi nri na inye aka na fatịlaịza bụ ụfọdụ atụmatụ gọọmentị rụworo ọrụ nke ọma n'ịhụ na nchekwa nri nye ezinụlọ ndị nọ n'ahụhụ na nsonaazụ dị ebe ahụ ka onye ọ bụla hụ.
- Ọ dị mkpa ịkụziri ụmụ akwụkwọ gbasara nhazi na ọnọdụ nke iwu. Enwere ike ọ nweghị iwu na-enye ohere iji gbaa ụmụ nwanyị ume isonye na nzuko omeiwu mana ụmụ akwụkwọ a nọ n'ọnọdụ ịgbanwe nke ahụ ma kpalie ha itinye ọnụ na ọkwa mkpebi niile.
- Ugandan university women on study tour The New Times (January 28, 2016)
- Nhazi nke ndị omeiwu kwesịrị ịbụ 50% ụmụ nwoke na 50% ụmụ nwanyị iji hụ na nha nhata nke nwoke na nwanyị.
- RWANDA PARLIAMENT PASSES BILL TO AMEND CONSTITUTION KT Press (October 12, 2015)
- N'ịga n'ihu na nkọwa ndị ozi ahụ na-enye, ọ dị ka a ga-edozi okwu niile mana n'oge mgbasa ozi anyị, anyị achọpụtala ka ndị ọrụ ugbo na-ata ahụhụ iji nweta agro-chemicals na fatịlaịza.
- House sets up committee to investigate loss-making agriculture sector Rwanda today (MARCH 28 2019)
