Gaa na ọdịnaya

Emma Grede

Sitere na Wikiquote

Emma Grede(a mụrụ ya na 23 Septemba 1982) bụ nwanyị ọchụnta ego Britain, onye na-emepụta azụmahịa ọhụrụ , na onye na-emepụta akwa. A maara ya nke ọma maka azụmahịa ya metụtara ndị òtù ezinụlọ Kardashian. Ọ bụ Onye isi nchịkwa na onye guzobere ụlọ ọrụ akwa denim a na-akpọ Good American, onye so na ndị guzobere Skims, nakwa onye guzobere ụlọ ọrụ Safely.

Okwu ndị o kwuru

[dezie]
  • "N’oge ahụ, emelarị m ụfọdụ mmekọrịta azụmahịa na-esi na nkà (talent-based equity partnerships) nke gara nke ọma, ebe onye nwere nkà na-enweta òkè (equity) n’ụlọ ọrụ ahụ. Mgbe m hụrụ otú ha si gaa nke ọma, m sịrị onwe m, ‘Aga m eme otu n’ime ha maka onwe m!".
  • "Echiche maka America dị mma bịara n'ihi na echere m na e nwere mgbanwe na-eme na omenala ndị a ma ama".
  • "Mgbe m na-arịgo n'ọkwa, onye ọ bụla dị gịrịgịrị, nke ahụ bụkwa ihe ọtụtụ ụmụ nwanyị chọsiri ike. Ma ọ dị nnọọ iche ugbu a".
  • "Echere m na ejiji na-efu efu. Ọ bụghị ihe gbasara onye buru ibu ma ọ bụ etu mmadu dị kama echere m na ekwesịrị ịnwe ụdị nke emeere onye ọ bụla. Ya mere, etu ahụ ka ezigbo American si malite".
  • “Nke a bụ otú anyị si eche, ma ọ bụrụ na ị kwenyere na anyị, sonyere anyị.” Anyị mere nnukwu nnọkọ ịhọpụta ndị ga-arụ ọrụ nke mmadụ 12,000 sonyere, ma anyị kwụsịrị ya n’ihi na anyị amaghị etú anyị ga-esi gụọ ha niile".
  • "Mgbe ị bịara LA dị ka nwa agbọghọ Bekee, ị ga-ahụ ụwa ọhụrụ nke ntutu isi na etemeete.A nabatara m nke ahụ".
  • Nke a bụ ihe dị mkpa: nguzozi n’etiti ọrụ na ndụ onwe onye bụ nsogbu gị, ọ bụ gị ga-achọta ụzọ isi dozie ya.”
  • N’ihi na otu anyị si arụ ụlọ ọrụ n’oge a bụ na ọ dịghị onye na-ahapụ ịga hụ dọkịta ezé,oge ịhụ dọkịta, ịkpụ isi, ma ọ bụ ịga nzukọ n’etiti nne na nna na ndị nkuzi nke nwa ha... nke ahụ abụghịzi etú anyị si arụ ọrụ ugbu a, ọ̀ bụghị ya?".
  • "Ị na-abịa ọrụ ma nwee oge ọrụ e debere gị, ma e nwekwara ohere mgbanwe n’ime ndụ ọrụ gị. Ọ bụghịzi dịka mmadụ ga-asị, “Ewoo! Onye a anọghị n’oche ọrụ ya!” Nke ahụ abụghịkwa otú anyị si arụ ọrụ ugbu a".
  • "Mgbe mmadụ na-agwa m banyere nguzozi nke ọrụ ha na ndụ ha na usoro ajụjụ ọnụ, ọ dị m ka, 'Onwere ihe na-eme gị. Ị nwebeghị ike ịchọpụta nke ahụ. Ọ bụghị etú ahụ ka ị ga-esi merie ajụjụ ọnụ a".

Njikọ mpụga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: