Gaa na ọdịnaya

Elmarie Linde

Sitere na Wikiquote

Elmarie Linde (amụrụ na Jenụwarị 9, 1971) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị South Africa na onye otu Ụlọ Ọchịchị Omeiwu (MP) maka Democratic Alliance (DA). A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye otu National Assembly of South Afrika n’ime ntuli aka ukwu South Africa nkè 2024, ebe ọ nọ na ndepụta mba nke òtù ahụ dịka onye nke iri isii na otu (61).

Okwu ndi Ọkwụrụ

[dezie]
  • Onye nnọchi anya ọha nwere ọrụ nye òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ na-anọchi anya na ọrụ nchịkwa gbasara ọkwa ọchịchị ebe ọ na-arụ ọrụ.
  • E kwere m na ime ka e nwee mmetụta site n’ịchịkwa ọrụ nlekota nke ọma ma gee ihe ndị mmadụ chọrọ ntị. Ihe na-enye m uru bụ na arụwo m ọrụ n’ala ruo afọ iri abụọ (n’ime ọchịchị na dịka ndị mmegide) n’ime obodo dị iche iche, ma aghọtakwa m mkpa na nsogbu ndị South Africa na-eche ihu kwa ụbọchị.
  • N’aka nke ọzọ, ọtụtụ mmadụ chere na ọchịchị ka họpụtara iji mee mkpebi kwesịrị ekwesị iji meziwanye ndụ mmadụ niile, ebe ụfọdụ na-eche na e gaghị elepụta échichè ha.
  • Ọchịchị kwesịrị ịmalite mmemme ọmụmụ ọha bara uru n’ụlọ akwụkwọ na mahadum, kụziere ndị mmadụ etu Ụlọ Omebe iwu si arụ ọrụ, mkpa isonye, na etu ha ga-esi kparịta ụka na ndị nnọchi anya ha ma mee ka ha jụọ ajụjụ maka ọrụ ha.
  • Ndị mmadụ kwesịrị ime ka olu ha nụrụ ma sonyere n’usoro mmekorita ọha, n’ihi na nke a na-enyere ọchịchị aka ime mkpebi ma weta iwu bara uru nye mmadụ niile.
  • Ndị nnọchi anya ọha kwesịrị ịbụ ndị na-etinye aka nke ọma iji kpalie ndị ha na-anọchi anya ka ha bịara mmemme, ma ọchịchị kwesịrị ime ka ọha mara nke ọma banyere mmemme ndị a, tupu oge ruru nke ọma.
  • E kwere m na mmadụ ọ bụla, n’agbanyeghị ebe o si, omenala ya, ma ọ bụ agba akpụkpọ ya, nwere ihe o nwere ike inye. Anyị kwesịrị iji nke a mee ihe bara uru, ma ọ bụ ọrụ ọchịchị ịnye ohere zuru oke ka ndị bi n’ala niile nwee ike ịbanye n’ime ime ka mba anyị bụrụ ebe kacha mma ibi, rụọ ọrụ, ma nwee ndụ ụtọ.
  • Ụkpụrụ Kraịst na-eduzi ụkpụrụ m onwe m na mkpebi na omume m kwa ụbọchị, ma ana m agbalị ibi ndụ nke na-egosi nkwado m n’ime uche Chineke. Obi siri m ike ibi ndụ okwukwe Kraịst m n’ụzọ a na-ahụ anya, dịka inyere ndị ọzọ aka na ịkwado omume ọma na omume ziri ezi.
  • Anyị ga-emehie; igwe nwere ike kwụsị ma ọ bụ ọbụna daa, ma anyị bụ ndị na-anaghị ada mbà. Anyị nwere ike itinye igwe ahụ azụ ma gaa n’ihu njem anyị iji wuo South Africa nke ga-arụ ọrụ maka anyị niile.
  • Cheta, ihe niile anyị na-eme ugbu a bụ maka ọgbọ na-abịa. Anyị kwesịrị ịhapụ ihe nketa ha nwèrè ike ịnwere mpako n’ime ya.

Njikọ Mpuga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: