Edith Sempala
Ọdịdị
Edith Grace Sempala bụ onye injinia obodo Uganda, onye ọrụ gọọmenti, onye nnọchi anya obodo na onye n'ekwu maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye na-eje ozi dị ka onye isi na onye ndụmọdụ ọkwa dị elu na World Bank kemgbe 2008. Ọ bụbu onye nnọchi anya Uganda na mba Nordic, United States, African Union, Ethiopia na Djibouti.
Okwu okwuru
[dezie]- Ọrụ m dị ka onye nnọchi anya n'mba ụwa ime mmekọrịta ọha na eze maka Uganda n'ihi na mgbe ahụ a maara anyị nke ọma maka “Amin onye ọchịchị aka ike.”.
- Chebe agwa gị n'ihi na ọ ga-ekpebi ịdị elu gị.
- Mkpesa bụ ihe nkịtị ọbụna na ọchịchị onye kwuo uche ya. Nke a apụtaghị na ị ga-ebuli ngwa ọgụ.
- Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, olee obodo anyị chọrọ inwe, oleekwa otú anyị ga-esi ruo ebe ahụ?
Nke a bụ mkparịta ụka anyị kwesịrị inwe ma ọ bụrụ na anyị ga-agbaji usoro anyị nọ na ya. Anyị enwebeghị mgbanwe udo nke ọchịchị kemgbe nnwere onwe. [4]
- Ihe ịma aka kasịnụ bụ na anyị ketara ntọala na-ezighi ezi site na colonialism. Anyị nwere ohere iwulite ntọala anyị, mana Obote chọrọ ichekwa onwe ya; ya mere e meghị ntọala ahụ.
