Gaa na ọdịnaya

Boipelo Sadi Dikgaka

Sitere na Wikiquote

Boipelo Sadi Dikgaka ma ọ bụ naanị Sadi, bụ onye ọchụnta ego mgbasa ozi, onye nnabata Igwe onyonyo, onye na-eme ihe mgbasa ozi ọha , onye mmetụta ịma mma na ihe ejiji,onye nlereanya, ika nnọchiteanya na onye ọbịa mmemme. Ọ na-eme ihe mgbasa ozi BSD nke bụ usoro nwere ọtụtụ akụkụ nke gụnyere ihe ngosi TV, egwu, ime ihe, ịbụ abụ na ejiji. A mụrụ nwa amaala Molepolole bụ onye ama ama maka ịnabata ihe nkiri telivishọn, o nwere akara ugo mmụta na BCom Marketing si Mahadum Botswana.

Okwu ndị okwuru

[dezie]
  • "Ị ga-amụta usoro igwe mmadụ, asụsụ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ọ bụghị mgbe niile ka anyị kwesịrị itinye ume anyị n'otu iyi. Ọ na-adịkwa m ka m nwere ike ikere òkè karịa mgbe m banyekwara na mba ndị ọzọ,”
  • “Ndị mmadụ na-echekarị na i kwesịrị ime mgbanwe n'ụzọ ụfọdụ. Ya mere, ugbu a, m na-ere onwe m, nke kacha mma n'ime m. "
  • “Akara gị pụrụ iche bụ ihe na-ere, ma ọ bụ ya ga-ekewapụ gị. Eziokwu kwesịrị ịbụ ebe ire ere gị. "
  • Ezinụlọ abụghị naanị njikọ sitere n'ọbara, ọ na-ejikọ anyị ma anyị gbakọọ ọnụ.”
  • "Ndị mmadụ na-echekarị na ọ bụrụ na ị bụ onye ọha na eze, ọ dị mkpa ka ị nwee ihe oyiyi, na ị ga-enwe ọdịdị ahụ na ị ga adị n'otu ụzọ. Enwere ụbọchị m kụrụ ntu n'isi ma enwere ụbọchị m na-akụghị. "
  • "Ka ị nwee afọ ojuju n'ịmara na izu okè bụ ihe efu na ido onwe gị n'okpuru onye ọ bụla ọ bụ."
  • "N'agbanyeghị nke ahụ, ị nwere ike imeri ihe na-adịghị mma site n'iji ndị nwere ezi uche gbaa onwe gị gburugburu na icheta eziokwu gị."
  • Achọrọ m ime ka nwa agbọghọ ọ bụla kpalie na nrọ ha abụghị nanị na ọ bụ ihe ziri ezi kama ọ pụrụ ị bia na mmezu.”
  • “Ịbụ abụ, ịgba egwu, nka, imewe ejiji na etemeete; Achọrọ m ka ọ dị iche iche dị ka o kwere mee. Enwere m olile anya ịhụ nka dị ka onye na-enye aka na GDP nke mba anyị.
  • “Ana m ekpe ekpere mgbe nile ka uche Ya mee ná ndụ m,”
  • “Ịmara na ọ bụghị naanị m nọ na-akpali m. Enwere m ọtụtụ ihe m ga-enye n'agbanyeghị na ike na-agwụ m mgbe ụfọdụ.”

Njiko Mpuga

[dezie]