Gaa na ọdịnaya

Basil of Caesarea

Sitere na Wikiquote
Basil_of_Caesarea

Basil of Caesarea a na-akpọkwa Saint Basil the Great (amụrụ n'ọnwa Jenụwarị 1 ma ọ bụ 2, 379), bụ bishọp Byzantine nke Sesaria Mazaca na Cappadocia, Asia Minor (Turkey nke oge a).Ọ bụ ọkà mmụta okpukpe a ma ama bụ́ onye kwadoro ozizi Nicene ma na-emegide ozizi ụgha nke chọọchị Ndị Kraịst oge mbụ, na-alụso ma Arianism na ndị na-eso ụzọ Apollinaris nke Laodicea ọgụ.

Okwu ndi okwuru

[dezie]
  • Mgbe mmadụ zuru uwe onye ọzọ, anyị na-akpọ ya onye ohi. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịkpọ onye gba ọtọ uwe ma ghara iyi otu aha? Achịcha nke dị n'ime kọbọd gị bụ nke onye agụụ na-agụ; Uwe ahụ a na-ejighị n'ime ụlọ gị bụ nke onye chọrọ ya; akpụkpọ ụkwụ na-ere ure n'ime ụlọ gị bụ nke onye na-enweghị akpụkpọ ụkwụ; ego nke unu na-akwakọba bụ nke ndị ogbenye.
  • Ezi omume anaghị efu; onye nāgha ezi omume nēweta enyi: Ọzọ, onye nāku ezi omume nāchikọta ihu-n'anya.
  • A na-ama osisi site na mkpụrụ ya; nwoke site n'omume ya. Ezi omume anaghị efu; onye nāgha ezi omume nēweta enyi: Ọzọ, onye nāku ezi omume nāchikọta ihu-n'anya.
  • Amaara m ọtụtụ ndị na-ebu ọnụ, na-ekpe ekpere, na-asụ ude, na-egosipụtakwa ụdị nsọ nsọ ọ bụla, ma ọ bụrụhaala na ọ naghị efu ha ihe ọ bụla, ma ha agaghị eso otu penny nyere ndị nọ n'ahụhụ aka.
  • Ị meghi ebere; agaghi-egosi gi ya. Ọ bughi ulo-gi ka i meghere; a ga-achụpụ gị n’alaeze. unu enyeghi nri-unu; ị gaghị enweta ndụ ebighị ebi.
  • N’ihi na ọ bụrụ na anyị niile na-ewere naanị ihe dị anyị mkpa iji gboo mkpa anyị, na-enye ndị na-enweghị ihe fọdụrụnụ, ọ dịghị onye ga-abụ ọgaranya, ọ dịghịkwa onye ga-abụ ogbenye, ọ dịghịkwa onye ga-enwe mkpa.
  • Onye nāku ezi-omume nāchikọta ihu-n'anya.
  • Ọ bụ ezie na ị na-agwa onwe gị okwu na nzuzo, a na-enyocha okwu gị n'eluigwe.


Njikọ mpụga

[dezie]
Wikipedia
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: