Assumpta Nnaggenda-Musana
Ọdịdị
Assumpta Nnaggenda-Musana' (ọna azabu Assumpta Nnaggenda), nakwa dịka Assumpta Nnaggenda Musana, bụ onye Uganda na-ese ihe owuwu , onye na-eme atụmatụ ndozi obodo na agụmakwụkwọ, Ọ na-eje ozi dị ka onye nkuzi na ngalaba ise ihe owuwu na atụmatụ maka iji ala eme ihe"na Mahadum ochie nke Artrere nke nka na uzu , na Mahadum ochie nke Injinia, na nkà na ụzụ nke ochie nke Uganda. Ọ bụ nwanyị mbụ na Uganda nwetara akara ugo mmụta doctorate na ise ihe owuwu, kemgbe February 2019, ọ bụ naanị ya.
Okwu ndi okwuru
[dezie]- Ọtụtụ ndị na-eto eto na Uganda ma ndị nọ n'ime ụlọ ọrụ ise ihe owuwu ma ndi anọghi na ya agwala m na ha chọrọ ịdị ka m, nke m chere na ọ bụ ihe dị mma n'ihi na ọ na-akpari obi Na ngalaba ise ihe owuwu karịsịa ebe nwanyị nọ.
**[1]
- Nkuzi bụ ọrụ nwere okpokoro oge , nke a na-enye ohere maka ime ụfọdu ihe ndi ọzọ. M na-eme ihe omume ndị ọzọ dị ka itinye aka na onwe m . Ọ na-atọ ụtọ iso ndị na-eto eto (ụmụ akwụkwọ) na-akpakọrịta, enwere ọtụtụ ihe ị ga-amụta n'aka ha, ọ na-emekwa ka mmadụ nwee mmetụta dịka nwatakịrị ọzọ.
**[2]
- Ụmụ agbọghọ ndị chọrọ ịgụ ise ihe owuwu na nhazi obodo kwesịrị ịma na O siri ike nakwa na ha kwesịrị ijikwa oge ha nke ọma ka ha ghara ịla azụ wee si otú ahụ kwụsị ma mmebie mmasị na nkuzi ahụ. Ọ dị mma ịgwakọta ọrụ na egwuregwu mana ọ dị mkpa ka ị nọgide ma nọsieike na ihe ịna eme.
**[3]
*Dịka onye na-ese ụkpụrụ ụlọ/onye na-eme atụmatụ ime obodo, ebe m nwere mmasị gụnyere nyocha nhazi nke mmadụ, ọkachasị n'ịmụ ebe obibi ndị na-adịghị mma na ụlọ ndị na-akpata obere ego iji guzobe ka a ga-esi melite ọnọdụ ụlọ maka ọdịmma ezinụlọ ndị na-enweghị ego. **[4]
- site na nke dabere na nke ndi oyibo nke eji ugegbe wee wue rue ruo ebe anyị na-ahụ ụdị dị iche iche. Ikekwe n'ime afọ iri na-esote, anyị ga-ahụ ngwá ọrụ nke njirimara mba anyị na-apụta n'ụdị ụdị omenala dị iche iche na-apụtakarị na ihe owuwu nke gbara anyị gburugburu.
**[5]
